atọ
Ọdịdị
Nkọwa
[dezie]Atọ bụ otu n'ime ọnụọgụgụ igbo. A na agụ ya ma agụchaa abụọ, tụpụ aguo anọ.
Nkejiasụsụ
[dezie]Aha
Ọmụmatụ
[dezie]- Ndị oji egbe ezu ahụ, dị ịtọ. (Nnewi, Awka, Onitsha)
- Ọjị Igbo gbara atọ ka a na-akpọ Ọjị Ikenga. (Owerri)
- E nwere ewu etọ n'ogige. (Nsukka)
- E nwe m umurima etó. (Abrịba)
- Ụmụaka etọ nọ n'azụ ụlọ. (Afikpo)
Mkpọpụta
[dezie]
Olumba
[dezie]- ịtọ→ Anambra(Nnewi, Awka, Onitsha)
- atọ→ Imo(Owerri)
- etọ→ Enugu(Nsukka)
- etó→ Abia(Abrịba)
- etọ → Ebonyi(Afikpo)