agbọghọbịa
Ọdịdị
agbọghọbịa
Nkọwa
[dezie](A na-kpọkwa ya agbọghọ) nwata nwanyị na-eto eto, toferela afọ iri na asaa. (Mgbe e nwere abụọ ma bụ karịa, ọ bụrụ ụmụagbọghọbịa ma ọ bụ ụmụagbọghọ.)
Nkejiasụsụ
[dezie]Āhà
Ọmụmaatụ
[dezie]- Nke ahụ bụ njirimara agbọghọbịa.
- Ada Mz. Okonkwo abụrụla agbọghọbịa.
- Ihe ọjọọ na-eme n'oge ugbua mere ọ dị ka ịbụ agbọghọbịa bụ nnukwu ọghọm.
Were nkea tụnyere ya
[dezie]okorọbịa
Mkpọpụta
[dezie]
Olumba
[dezie]- agbọghọbịa→Anambra(Nnewi, Awka, Onitsha)
- nwa agbogho→Imo(Owerri)
- nwangbọkọụ→Enugu (Nsukka)
- nwangbọkọ→Abia (Abirịba)
- nwangbọkọ→Ebonyi (Afikpo)