Nnabata ọnọdụ mgbanwe ihu igwe

O sị Wiktionary

Nkọwa[dezie]

Nke a bụ ọnọdụ inabata nwoharị nke ihu igwe site n'ibi ndụ na gburugburu ụwa dị ka mgbanwe Ihu Igwe si dị na ibelata oghọm mgbanwe a nwere ike ibute. Nke a nwere ike ịbụ site na mgbawa ala nke n'ebute mbize,ide nke na akpata nkwaharị n'obodo,agbamọkụ nke oké ọhịa nke n'ebute ọnwụ anụ ọhịa,ụ́nwụ́ nke n'ebute ọnwụ ihe ọkụkụ dgz. Mgbe Mgbanwe ndị a mesịrị, mmadụ ndị nọ na gburugburu ụwa n'ebi ndụ ha tụmadị ebe ọ ga enwe nkwekọrita nye ọnọdụ ihu igwe dị ka igwumi osimiri maka iju, ịwa ọwa mmiri iji gbochie mbize dgz.

Nkejiasụsụ[dezie]

Aha

Ọmụmatụ[dezie]

Ndị mba mmiri na anabata ọnọdụ mgbanwe ihu igwe site n'ibụ̀ ihe ọkụkụ ha n'oge tupu iju amalite.

Mkpọpụta[dezie]

Nnabata ọnọdụ Mgbanwe ihu igwe


Olumba[dezie]

Ntụgharị n'asụsụ ọzọ[dezie]

Bekee[dezie]

Climate change adaptation