ọgbụgba ndụ'''
Ọdịdị
Ọgbụgba Ndụ
Nkọwa
[dezie]Nkwekọrịta n'etiti ótù mmadụ na ibe ya, mmadụ abụọ maọbu karịa, ìgwè mmadụ na ìgwè mmadụ ibe ha maọbukwanu mba na mba, ime ótù ihe, maọbu ikwekọrịta òtù ha ga-esi na-emeso onwe ha omume, nke a na-agaghị emebi emebi, nke onye mebiri ya ga-enwe nsogbu na abụghị mmadụ ga-enye ya. Ndị na-eme nkwekọrịta à nwere ike ịracha ọbara akatara n'ahụ ha ma ọ bụ e jiri ọbara anụmanụ mee ya.
Gbaa ndụ (Ngwàà) nke pụtara: banye n'ọgbụgba ndụ; Gbara ndụ(ngwàà) nke pụtara: mere ọgbụgba ndụ
Nkèjiasụsụ
[dezie]Mkpọàhà
Ọmụmaatụ
[dezie]- Ngọzị na Chukwuemeka nwere ogbugba ndụ (gbara ndụ) na ha gụchaa akwụkwọ mahadum, na ha ga-alụ di na nwunye
- Ndị mbammiri na ndị eluala nwere ogbugba ndụ na o nweghị onye ga-egbu nwanne ya, ma n'ụlọ ma na mba.
Mkpọpụta
[dezie]