ọchịọra ụmụnwaanyị
Ọdịdị
Ọchịọra Ụmụnwaanyị
Nkọwa
[dezie]- Nke a bụ onyeisi na-achịkọta ụmụnwaanyị bu nke ụmụnwaanyị rọpụtara ka ọ na-achị ha.
- ọchịọra ụmụnwaanyị nwekwara ike ịbụ aha echichi nwaanyị bụ nke e nwere ike ịkpọbiri dika ọchịọra
Nkejiasụsụ
[dezie]Aha
Ọmụmaatụ
[dezie]- Ọchịọra ụmụnwaayi obodo Abangwu kpọrọ anyị oriri ịgbape ụlọ na ngwụcha ọnwa.
Mkpọpụta
[dezie]
Olumba
[dezie]- Ọchịọha ndị iyom —> Anambra (Nnewi, Awka, Onitsha)
- Onyeishi ndom —> Imo (Owerri)
- Onye ishi njiomu —> Enugu (Nsukka)
- Onyeisi ndi inyom —> Abia (Abírịba)
- Onyeisi nde nwaghị —> Ebonyi (Afikpo)