Gaa na ọdịnaya

ịgba ndụ

Sitere na Wiktionary

ịgba ndụ

Nkọwa

[dezie]

Nkwekọrịta a na agaghị emebi emebi, nke onye mebiri ya ga-enwe nsogbu na abụghị mmadụ ga-enye ya; otu onye, mmadụ abụọ ma ọ bụ karịa, na otu onye, mmadụ abụọ ma ọ bụ ìgwè mmadụ ọzọ, ma ọ bụkwanụ mba na mba ikwekọrịta n'ụzọ dị otu a otu ha ga-esi emeso onwe ha, ma ọ bụ ihe ha na aghaghị ime. Ndị na-eme nkwekọrịta à nwere ike ịracha ọbara akatara n'ahụ ha ma ọ bụ e jiri ọbara anụmanụ mee ya.
gbaa ndụ (ngwàà) nke pụtara: banye n'ịgba ndụ; gbara ndụ (ngwàà): nke pụtara: mere ịgba ndụ (Hụkwa ọgbụgba ndụ)

Nkejiasụsụ

[dezie]

Āhà

Ọmụmaatụ

[dezie]

Ngọzị na Chukwuemeka mere ịgba ndụ (ya bụ, gbara ndụ) na ha gụchaa akwụkwọ mahadum, ha ga-alụ di na nwunye; Ndị Mbammiri na ndị Eluala mere ịgba ndụ na o nweghị onye ga-egbu nwanne ya, ma n'ụlọ ma na āmā.

Mkpọpụta

[dezie]

Olumba

[dezie]

Ntụgharị n'asụsụ ọzọ

[dezie]

English

[dezie]

Covenant