nsọala
Ọdịdị
nsọala
Nkọwa
[dezie]omume a na ekwesịghị inụ na mmadụ mere n'obodo; omume dị njọ ruo na obodo machibidoro omume dị otu ahụ na-enwe nsogbu ma mmadụ mee ya, tinyere na onye mere ya na-enwekwa nnukwu nsogbu nke pụrụ ịbụ ọnwụ ma ọ bụ ịyị ārà, kama ma onye mere ya o wetara ihe dị iche iche a ga-asị ya weta a ga-eji mee ka iwe arụsị na ndị mmụọ nwe obodo ahụ dajụọ; arụ
Nkejiasụsụ
[dezie]Āhà
Ọmụmaatụ
[dezie]Ihe gburu Maazị Ojemba na nwunye ya bụ na nwunye ya mere nsọala mana Maazị Ojemba ekwupụtaghị ya ka nwunye ya mee ihe o kwesịrị ime.
Mkpọpụta
[dezie]Olumba
[dezie]nsọanị; nsọalị