Otú:Ilu
Ọdịdị
Bugharịa gaa na
Peeji dị na ụdakọ "Ilu"
Ndị a na-eso 200 ibé bụ ndị nọ na ụdakọ a, n'ime ngụkọta dị 295.
(Peeji nke gara aga) (Peeji na-esonụ)A
- A chọ agụ ahụghị, e kpue ngwuru ya
- A dịghị asị onye mara ihe pụta n' anwụ
- A gbaka m mbọ bụ ego nri, ụba si na Chi
- A kụọrọ agadị nwaanyị egwu ọ maara agba, o welie mkpọ ya,
- A na-agwa ntị ma ntị anụghị, e gburu isi ntị esoro ya
- A na-esi n'ụlọ mara mma pụwa na ama
- A naghị agwa ọ tara ọkpa odudu ňụọ mmịrị
- A naghị anụ isi ndị mmụọ ghewe ọnụ oghe
- A naghị ata ọkpụkpụ nshịkọ na nzuzo
- A naghị eji abalị arọ anya
- A naghị eti nwata ihe mbọchị ọkwafuru mmanụ, ọ bụ ụbọchị ọ kwafuru ogiri
- A nyụkọọ mamịrị ọnụ ọ gbaa ụfụfụ
- A tufuo azịza ụlọ, ụtụtụ a chọba ya
- A tuọrọ ọmara, ọ mara, ma a tụọrọ ofeke, o fenye isi n'ọhịa
- A tụa ilu nkịrịka nkata, onye tara arụ amara.
- A tụọrọ ọmara, ọ mara, a tụọrọ ofeke, o fenye isi n'ọhịa
- Adịghị ebute ozu ọdụm n'ụlọ
- Agadi nwaanyị anaagi aka nkà n'egwu ọ mara agba.
- Agadi nwany anaghị nka n'egwu ọ maara agba
- Agadi nwanyị anaghị aka-nka n’egwu ọ ma agba
- Agadị wekọtacha ọkazị ma gbajie mgbọrọgwụ ya, agụụ bịara n'afọ nke mbụ ga-abịakwa ọzọ.
- Agbacha ọsọ a gụọ maịlụ
- Agbaghị mbọ bụ erighi nri
- Agbanwe dike izuzu, agbaya ria ya
- Agbịsị gbaa otule, ọ mụrụ akọ
- Agha azụ adịghị egbu nnụnụ
- Agu majua akara ya na eghu alaru n'otu ulo
- Agwa ka mma ma eke tua
- Agwa ogbenye ihe eji ab’ogaranya, osi ka ya buru ogbenye ya bu.
- agwọ aghaghị ịmụ ihe toro ogologo
- Agwọ emeghi ihe o ji bụrụ agwọ, ụmụaka ewere ya kee nkụ
- Agwọ emeghị ihe o ji bụrụ agwọ, ụmụaka ewere ya hie nkụ.
- Aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ
- Aka na aga na akụkụ ọkụ na agakwa na akụkụ ọnụ
- Aka wete, aka wete, oju ọnụ
- Akidi Siri Na ura kwere izu aburula onwu
- Aku ji afọ ekoeb aka
- Akwụkwọ juru n'ọhia, ma a baa a chọba ọkazi
- Ama aputa na igwe nnunu gbaba nza
- Ama ka nwoke siri sie ike ọgaghị atuso chi ya ọgụ
- Amamihe bụ ugwu, ugwu, o nweghị onye nke ya jụrụ eju
- Anaghi aso mgbagbu a ga ogu
- Anaghị ekpuchi afọ ịme aka
- Anamụ agbara okwu na uka ji uchichi wee ni nne ya
- anwụ gba nwa nkịta,,ọ tụba okporoko ijiji egwu
- Anya bewe, imi ebewe
- Anya hụrụ oke osimiri agaghị ekwu maka mmiri iy
- Anya ka eji ama oka chara acha
- Anụ bụ ụzọ na-aṅụ mmiri ọma
- Anụ gbaa ajọ ọsọ, a gbanyere ya ajọ egbe
- anụ gbanari taa, echi bụ nta
- Anụahụ agụ mara mma, ma ọ bụghị obi ya
- Ara ka mma n'okorobia
- Ara na obi anaghị ese okwu
- Arụ gbaa afọ ọ bụrụ omenala
- Asaa dị mma asatọ dịkwa mma
- Atuọrọ ọmara, ọmara, mana atuọrọ ofeke otinye isi n'ọhia.
- awo adị agba ọsọ ehihie na-nkịtị
- Awọ anaghị agba ọsọ ehihie n'efu
- Azu na-eloghi ibe ya adighi ebu
- Azụ rahụ ụra, azụ ibe ya eloo ya
E
- E duputa azi na ama, o si na ya amala uzo
- E jide dike n'ala ma e kwotaghi ya mma,ọ bụzi mgbe o biliri ọtọ?
- E jighi ego eme nwanne
- E jighi iwe oke esu ulo ọkụ
- E lelịa nwa ite,ọ gbọnyụọ ọkụ
- e mee ngwangwa emeghara ọdachi
- E nwere ike ịmata ọka chara acha site n'ọdịdị ya
- E nwude onye ori na ihe o mere arụ, o mụba amụ elelele
- E were mgbanu gwujie ji,etukwuru ala gwute odudu ya
- Ebe ana-adụ nwa nwere nne ọdụ ka nwa n'enweghi nne na amụta ihe
- Ebe nwatakịrị na-ebute ọnụ mmanụ-mmanụ ka ọ na-apụ ọrịrị
- Eburu ụzọ zọta ala, azọba ute.
- Echi dị ime
- Echi echi kpatara awọ enwela ọdụdụ
- Egbe belu, ugo belu, nke si ibe ya ebena nku kwaa ya"
- Egbe bere ugo bere nke si ibe ya ebele, nku kwaa ya.
- Egbe bere ugo bere nke sị ibe ya ebela nku akwala ya kama ya gosi ya ebe ọ ga-ebe
- Egbe Bere Ugo Bere, nke si Ibe ya ebela, nku Kwa ya.
- Egbe na-ebu ogidi ga-ebu ogidi, nke na-adịghị ebu bue, o dajịa ya ọnụ
- Ego bu mma nkọ
- Ego bụ mma dị nkọ
- Ego dị na ogwu
- Egwu tuba ekperima ya ghara ohi
- Eji anya ama oka chara acha ma ntughe ya bu usa
- Ejighị akpata atụfuo aba ọgaranya
- Ejighị ụtụtụ ama njọ ahịa
- Ekweghi ekwe na-ekwe n'ute ekwere
- Ekwue ma ntị anụghị, eburu ịsị ntị esoro ya
- Emesia, emesia bụ ọnwụ na-egbu onye ume ngwụ.
- Enwe siri na ya agaghi ara nwa ya bere ma o gbara ikpuru
- Erekwala ọkụkọ nwere otu ọkpa n'akụkụ ebe ibi
- Erie mụ zie eze, ezie mụ, a sị mụ were isi mụ bue ajụ m
- Ewu nwa ogbenye bụ efi ya
- Ezi aha ka ego
- Ezigbo ọyi ka ajọ nwanne
- Eziokwu bụ ndu
I
- Ichekiriche nwe elu nkwu,nwa mbgada nwe uzo ohia
- Ichi abụghị uri edehie edeghaa
- Igwe bu ike
- Ihe agwọ mụrụ aghaghị idi ogologo
- Ihe ehi hụrụ gbalaga ọsọ ka ọkụkọ hụrụ n’atụ ọnụ
- Ihe okenye n'ala were hụ,nwata rigo elu osisi ọ gaghị ahụ ya
- Ihe okenye no n'ala hu, nwata rigodu elu nnukwu osisi, ogaghi ahu ya
- Ihe okenye nọ ala hụ, nwata rịa ugwu kasi ibe ya elu, ọgaghị ahụ ya.
- Iji ntị ike n'eso ozu ala n'ili
- Ijiji muma atụ nkwe na ikpo nsi kariri ya
- ijiji ntị ike na eso ozu ala n'ili
- Ilo ka n'ụlọ
- Ilu bụ mmanu e ji eri okwu
- Imi bewe,anya ebewe
- Ire ọma ka ejula ji aga n' ogwu
- Ire ọma ka ejụla ji aga n'ọgwụ
- Isi kote ebu, ọ gbaa ya
- Isi kote ebu,ọ gbaa ya
- Isi kote ebu,ọgba ya
- Isi na-awa onye chị ọra.
K
- K'eletachaa ka mgbọ jị atụ enwe n'isi
- Ka a hụtasịa na egbu nwa enwe
- Ka a na-achu àjà, ka íkpé na-ama ndi mmụọ
- Ka enyochata ka mgbọ ji tụọ nwa enwe n'iru.
- Kama ite mmanya ọcha ga-esegbu enyi abụọ, ya tiwa n'ụzọ
- Kama rijuo afọ dachie ụzọ, e bụrụ m afọ anighini laba
- Kama ụsụ ga atam, ya fere
- Kama ụsụ ga-atagbu m, ya fere laa.
- Kama ụsụ mara n'ọnya m ga-atagbu m ya felaa
- Kpo achịcha ka obere otu ụkpa
M
- Mba mba ana-abara agu, oge a huru agu erebe ala.
- Mberede ka e ji ama dike
- Mberede nyịrị dike, mana mberede ka-eji ama dike.
- Mgbe isi rere, ahụ niile na-arịa
- Mgbe nne ehi na-ata ahịhịa, ụmụ ya na-ele ọnụ ya anya
- Mgbe nnukwu anụ ji apụta n’ọhịa bụ mgbe dinta sọrọ ngọngọ ọrụ
- Mgbe nwoke otu ụkwụ ji ekele Chukwu bụ mgbe ọ hụrụ onye ngwụrọ
- Mgbe onye iberibe jiri mata ihe, nke onwere agwula.
- Mgbe onye ji tete bu ọtụtụ ya
- Mgbe otu onye isi di mma kpọrọ ndi ara iteghete gafee, ihe anyị mara bụ na ndị ara iri gafere
- Mmiri jụrụ jụụ ka na-emibì mmadụ
- Mmiri machie ukwu a zoro, mana amachila ajo okwu e kwuru n’onu
- Mmiri mara ugo sara ugo ahụ
N
- N'agbanyeghị etú ọchịchịrị si dị, aka mgbe niile maara ụzọ ọnụ.
- na-mgbe na-mgbe, chi ejie
- Ncha gbọọ ncha agbọghị a ga awụrịrị ahụ
- Ndu bụrụ ililo, ndi iro azogbusia onwe ha
- ngana kpue ute ,oge agụụ biara ,e kpughe ya
- Ngwere nile makpu makpu, amaghi nke afo na aru
- Ngwere si n'elu daa gbanari onye nọ n'ala si onye na-ajaghi ya ike ya aja onwe ya
- Ngwere si na ya si n'elu osisi iroko wụlata, ọ bụrụ na onye ọ bụla ekeleghị ya, ya onwe ya ga-ekele onwe ya
- Nkita na-egbụrịlụ onye ọ mara
- nkwucha abụghị ụjọ
- Nkịta amana uma taa akpa dibịa ma dibịa amana uma bu nkịta onu
- nkịta ụja adịghị ata ata
- Nkụ a kpara n'ọkọchị ka na-anya n'udu mmiri
- Nne ewu na-ata igụ, ụmụ ya a na-ele ya anya n'ọnụ.
- Ntukwu na-agu ngwere, ma odu ekweghi ya
- Nwa nkịta ndidi na-ata ọkpụkpụ anụ dị
- Nwa ọkụkọ pụta ụra ụtụtụ chụwa m ọsọ, m gbawa maka na amaghị m a o puru eze n'abalị
- Nwaanyi muta ishi ofe mmiri mmiri, di ya amuta ipi utara aka were suru ofe
- Nwanyi bu ife
- Nwanyi na ele-anya nwa n'aka Chineke anaghi eyi uwe-ukwu anaba ura.
- Nwanyọ nwanyọ k'eji ari ugwu.
- Nwata a kwọ n'azụ amaghị na ije dị anya
- Nwata akwo n'azu amaghị na ije di ufu
- Nwata akwọ n'azụ amaghị na ije dị anya
- Nwata bulie nna ya elu, ogodo ayochie ya anya
- nwata bulie nna ya elu, ọgọdọ ekpuchie ya ihu
- Nwata buru ọkụ jide mma, ọkụ ereghị ya mma eyie ya
- Nwata etozughi etozu mara ogodo, ikuku eburu ya.
- Nwata hụrụ ọgụ e gboro egbo sị na ọgụụ na-atọ ka nri
- Nwata jide ọkụ jide mma, ma ọkụ ereghị ya, mma eyie ya
- Nwata kwọchaa aka, o soro ndị okenye rie ihe
- Nwata lelịa nna ya ike, ọ kpọọ ya nkụ
- Nwata mụta iri elu, nne ya amụta ibe akwa"
- Nwata na-ata akara, na-ata ego ya.
- Nwata nna ya ziri ozi na-agba okpa na mgbo.
- Nwata rie awọ, ọ jụ anụ
- Nwata rie ihe o kwo mụrụ anya ụra atụwa ya
- Nwata si sue agbara oku nya agbakwara oso
- Nwayọ nwayọ bụ njem
- Nwude oke nwude oke, oke a sị na-anụrụ na ya a na-agbaka
O
- O choro ka nwata kparia ya kpọnye ya nwunye ya.
- o gara n' uzo amaghị na iruro puru nti
- O mee ka e too ya kọrọ ji na ọbọ ọkpụ kee ya n’afọ ọnụ
- O nweghị onye na-ajụ ofe azụ juputere na ya.
- Obere ehi mụọ abụọ, a sị na o mee arụ,o ruo ka nke nnukwu mụrụ abụọ, ọ bụrụ ihe ngori
- Obughi ka aki ilu si ada na onu ka o si ato n'onu
- Obụrụ na akwa tie akị, ihere emebe mkpume
- Oge adịghị eche mmadụ
- Ogologo abughi na nwa m e tola
- Ogologo abụghị na nwa m etoola
- ogologo okwu adiro n'uka ngbede
- Ohia e butere ozu nnunu Imara Na ihe na-egbu ya no Na ya.