Abalị
Ọdịdị
Abalị
Nkọwa
[dezie]Abalị bụ oge nke na-esochi ehihie, mgbe anyanwụ na-apụ n’anya ma ụwa na-ejupụta na ọchịchịrị. Ọ bụkwa oge izu ike, izu oyi, na ụfọdụ omume ndị mmadụ na-eme tupu ụra.
Nkejiasụsu
[dezie]Aha
Ọmụmaatụ
[dezie]- Ọ bụ anyasị ka ndị ajọ mmadụ ji eme mpụ. (Nnewi, Awka, Onitsha)
- Ujushi bụ oge mmadụ nile ji ezuru ike. (Owerri)
- Ezinne gara ụlọ ekpere enyasi iji kpee ekpere. (Nsukka)
- Ụka anyị ga-enwe ekpere enyasi taa. (Abrịba)
- Abalị dị oke egwu. (Afikpo)
Mkpọpụta
[dezie]A/ba/nị
Olu mba
[dezie]- anyasi→ Anambra(Nnewi, Awka, Onitsha)
- ujushi→ Imo(Owerri)
- enyasi→ Enugu(Nsukka)
- enyasi→ Abia(Abrịba)
- abalị→ Ebonyi(Afikpo)